Home 🎬 Bollywood 🎵 Pakistani 🎤 English Pop

Ezi Nwanyi

👤 Evang. Nnamdi 🎼 Ogoli Nwanyi, Vol. 2 ⏱️ 6:48
🎵 2478 characters
⏱️ 6:48 duration
🆔 ID: 9311952

📜 Lyrics

Ezinwayi Mara obi nke di'ya (×2)
Onye ezi omume, onye inye-aka nke nma si na igwe wé ziterem ooo

Ezinwayi Mara obi nke di' ya (×2)
Onye ezi omume, onye inye-aka nke nma si n'igwe wé zitérém ooo.

Ōna émé ihe obim nācho (×2)
Ngaba Uzö ijé lóta
Ogoli Mara obi nke diya
Emem' obi añuri

Ōna émé ihe obim nācho (×2)
Ngaba Uzö ijé lóta
Ogoli Mara obi nke diya
Emem' obi añuri

Odighi émé' ihe ge ewé gi iwé
Odighi achō ihe ge ewé gi iwe
Omé mistake émé' og'esekpuru ala we yo diya ngba'ghara aaa...

Nwayi nmō Chineke n'achi
Obu ih'aaa k'eji Mara ya

Odighi émé' ihe ge ewé gi iwé ma'ōli
Odighi achō ihe ge ewé gi iwe
Omé mistake émé' og'esekpuru ala we yo diya ngba'ghara inugo ooo...

On'amuta Umu nke Mara nma na' obodo
On'amuta Umu nke Mara nma, ōmuta umu nke Mara nma
Onye ha ezi nkwado
Owé gbuzu o ōcha'ke

On'amuta Umu nke Mara nma
On'amuta Umu nke Mara nma, ōmuta umu nke Mara nma
Onye ha ezi nkwado
Owé gbuzu o ōcha'ke

Simi Christy ghotara ihe nnekwu
On' enwé kwa añuri maka n'ihi ná ōchōtara ezinwayi nke' Mara obi ya
Iso na ndi chotara ya?

Ezinwayi bu nke nwere agwa' oma
Ogoli nwayi bu nke nwere agwa' oma
Ichōba inu nwayi, gba nbō chota nke Chi'nenye
obu nk'ahu kacha nma

Ajō nwayi puru iwépu ndu gi iii n'uwa
Ajō nwayi puru iwépu ndu gi
Inuta ajō nwayi, udo g'agba ōsō na ndu gi ya n'ōga n'iru so ya

Ajō nwayi puru iwépu ndu gi n'ime obodo
Ajō nwayi puru iwépu ndu gi
Inuta ajō nwayi, udo g'agba ōsō na ndu gi ya n'ōga n'iru so ya

Nwoke obula chōrō inu nwayi, Néé' kwa ekpere ig'ekpe (×2)
Chineke nye' mu ezi nwayi nke Mara obim'muo
Nna nye' mu ezi nwayi nke Mara obim'muo
Obughi nke Mara mma na aru ma agwa ya jōrō njō
Obughi nke Mara mma, ma n'omume ya jōrō njō
Obughi oke akwa n'anyi ka nkpa, nwa mammy water
Enyé'la mu ya oooo.
Onye enyem'aka bu Chineke nyere'mu ya ooo
Onye inye'aka bu Chineke nyere'mu ya
Obu ya nyere mu ya we kpōyá onye ezi omume
Obu ya nyere mu ya we kpōyá onye ndum'ōdu
Obu ya nyere mu ya we kpōyá onye ezi omume
Obu ya nyere mu ya we kpōyá onye inye aka aaa...

Obu Chi nyere'mu o onye inye-aka nkwū aba
Chi nyere'mu o onye inye-aka nji egoli
Obu Chi n'enye onye obula yōrō ya
Igaghi ayō achicha onyé gi okwute Chineke adighi otu'a
Igaghi ayō azu onyé gi agwó Chineke adighi otu'a
Nwayi Mara obi nke diya ooh oooh oo.
Ihu'kwanu Nwayi Mara obi nke diya o
Onye ezi omume,
onye inye aka nke nma si na igwe we zitere' mu'o ighota' go ooo.

⭐ Rate These Lyrics

Average: 0.0/5 • 0 ratings